1Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya,
2ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya.
3Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.”
4Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị.