1Mgbe ị ga-aba nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa, mgbe ị nwetara ya, birikwa nʼime ya,
2ị ga-ewere ụfọdụ nʼime mkpụrụ niile si nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị, tinye ya nʼime nkata, were ya gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-ahọpụta, dịka ebe a kpọkwasịrị aha ya.
3Ị ga-agwakwa onye nchụaja nọ nʼọrụ nʼoge ahụ okwu sị: “Ana m ekwupụta taa nye Onyenwe anyị Chineke gị na abịala m nʼala ahụ Onyenwe anyị ṅụụrụ nna nna anyị ha nʼiyi inye anyị.”
4Onye nchụaja ahụ ga-anara nkata ahụ, dọba ya nʼihu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị.
5Mgbe ahụ, ị ga-ekwupụta nʼihu Onyenwe anyị Chineke gị sị, “Nna nna m bụ onye Aram na-awagharị awagharị, onye jere Ijipt izere ndụ. Ha dị ole na ole mgbe ha gara Ijipt, ma nʼIjipt ha ghọrọ mba dị ukwuu, ndị dị ike, na ndị bara ụba nʼọnụọgụgụ.