Diuteronomi 28

Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.

Deuteronomy 28:24 (UKJV) The LORD shall make the rain of your land powder and dust: from heaven shall it come down upon you, until you be destroyed.

22Onyenwe anyị ga-eti unu ọrịa na-eripịa eripịa, ahụ ọkụ na ọrịa na-aza anụ ahụ, oke okpomọkụ na mma agha, ụkọ mmiri ozuzo na ọrịa na-eripịa ihe ubi, na ọmụma ebu ga-abịakwasị gị tutu ruo mgbe i lara nʼiyi.

23Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe.

24Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.

25Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.

26Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.