23Mbara eluigwe nke ị na-ahụ anya ga-aghọ bronz, ala ị na-azọkwasị ụkwụ gị ga-aghọ igwe.
24Onyenwe anyị ga-eme ka mmiri kwesiri izo nʼala gị ghọọ uzuzu na aja. Ha ga-esi na mbara eluigwe na-ezodata nʼala tutu ruo mgbe ị lara nʼiyi.
25Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.
26Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.
27Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha.