Diuteronomi 28

Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha.

Deuteronomy 28:27 (UKJV) The LORD will strike you with the botch of Egypt, and with the emerods, and with the scab, and with the itch, whereof you can not be healed.

25Onyenwe anyị ga-eme ka ndị iro gị merie gị nʼagha. Ị ga-esi otu ụzọ pụta ibuso ha agha, ma ị ga-esi ụzọ asaa gbalaga. Ị ga-aghọrọ ndị ụwa ihe a na-asọ oyi mgbe ha hụrụ ihe dakwasịrị gị.

26Ozu unu ga-aghọrọ ụmụ anụ ufe niile na anụ ọhịa niile ihe oriri. O nwekwaghị onye ga-anọ menye ha egwu chụpụ ha.

27Onyenwe anyị ga-ezite etuto ndị Ijipt ka ha bịakwasị gị, ya na ọnya, na agba, na ọkọ. Ọ dịkwaghị ihe a ga-eji gwọọ ha.

28Onyenwe anyị ga-ezitere gị isi mgbaka, na ikpu ìsì, na ọgbaaghara nke obi.

29Ị ga-asọgharị isi nʼetiti ehihie dịka onye kpuru ìsì nʼasọgharị nʼọchịchịrị. Ọ dịghị ihe ọbụla ga-agara gị nke ọma. Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ị ga-abụ onye a na-emegbu emegbu, na onye a na-anapụ ihe ya nʼike oge niile, na-enweghị onye ga-anapụta gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.