30Gị na nwanyị ga-enwe nkwekọrịta ịlụ di na nwunye, ma nwoke ọzọ ga-eduru ya dinaa ya nʼike. Ị ga-ewu ụlọ ma ị gaghị ebi nʼime ya. Ị ga-akụ ubi vaịnị ma ị gaghị eri mkpụrụ si na ya.
31Nʼihu anya gị ka a ga-egbu ehi gị, ma ị gaghị ata iberibe anụ ya. A ga-anapụ gị ịnyịnya ibu gị nʼihu anya gị ma a gaghị eweghachiri gị ya. Atụrụ gị ka a ga-enye ndị iro gị. Ọ dịkwaghị onye ga-anapụta ha.
32A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.
33Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile.
34Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka.