Diuteronomi 28

Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka.

Deuteronomy 28:34 (UKJV) So that you shall be mad for the sight of yours eyes which you shall see.

32A ga-ewere ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nye ndị mba ọzọ. Ọ ga-agụ gị agụụ ogologo oge ka ị hụ ha anya, ma ị pụghị inyere ha aka.

33Mba nke ị na-amaghị ga-eri mkpụrụ ubi ị tara ahụhụ kụọ nʼala gị. Ị ga-abụ naanị onye a na-emegbu emegbu na onye a na-akpagbu ụbọchị ndụ gị niile.

34Ihe ndị a niile ị ga-eji anya gị hụ ga-eme ka i nwe isi mgbaka.

35Onyenwe anyị ga-eme ka etuto nke na-egbu oke mgbu a na-apụghị ịgwọta agwọta too gị nʼikpere na ogwe ụkwụ gị abụọ, ọ ga-agbasa site nʼọbọ ụkwụ gị abụọ ruo nʼopi isi gị.

36Onyenwe anyị ga-achụpụ gị na eze ahụ ị họpụtara nye onwe gị, chụpụ gị nye mba ọzọ, ebe gị na nna nna gị ha, na-amaghị. Nʼebe ahụ, ị ga-efe chi ndị ọzọ nke e ji osisi na nkume kpụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.