40Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru.
41Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.
42Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị.
43Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ.
44Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ.