38Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi.
39Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.
40Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru.
41Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.
42Igwe igurube ga-erichasị osisi niile dị nʼubi gị, ya na ihe ị kụrụ nʼubi gị.