Diuteronomi 28

Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.

Deuteronomy 28:39 (UKJV) You shall plant vineyards, and dress them, but shall neither drink of the wine, nor gather the grapes; for the worms shall eat them.

37Ị ga-abụ ihe iju anya, na ihe e ji atụ ilu, na ihe akụkọ, nʼetiti mba ahụ niile Onyenwe anyị ga-achụga gị.

38Ị ga-akụ ọtụtụ mkpụrụ nʼubi ma ị ga-aghọta ntakịrị mkpụrụ, nʼihi na igurube ga-ericha ihe ị kụrụ nʼubi.

39Ị ga-akọ ubi vaịnị lekọtakwa ya anya, ma ị gaghị aracha mkpụrụ ya maọbụ ṅụọ mmanya si na ya, nʼihi na ikpuru ga-eri ha.

40Osisi oliv ga na-eto ebe niile, ma mmanụ oliv agaghị adị nke ị ga-ete nʼahụ nʼihi na mkpụrụ oliv ga-adasịsị na-akaghị aka oge ha mara ifuru.

41Ị ga-amụta ụmụ ndị ikom na ndị inyom ma ha agaghị adịgide nʼihi na a ga-adọta ha nʼagha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.