43Onye ọbịa bi nʼetiti gị ga-aba ụba karịa gị. Ihe ga na-agara ya nke ọma, ma ihe ga na-ajọrọ gị njọ.
44Ọ ga-ebinye gị ihe, ọ bụkwaghị gị ga-ebinye ya! Ọ ga-abụ isi ma ị ga-abụ ọdụdụ.
45Ọbụbụ ọnụ ndị a niile ga-abịakwasị gị. Ha ga-achụso gị ọsọ, chụkwute gị tutu ruo mgbe a lara gị nʼiyi, naanị nʼihi na ị jụrụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, na idebe iwu na ụkpụrụ ndị a o nyere gị.
46Ha ga-abụ ihe ịrịbama na ihe ebube nye gị, na mkpụrụ gị niile, ruo mgbe ebighị ebi.
47Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma.