47Nʼihi na ị jụrụ iji ọṅụ na obi ụtọ fee Onyenwe anyị Chineke gị nʼoge ihe na-agara gị nke ọma.
48Ya mere, nʼọnọdụ agụụ na akpịrị ịkpọ nkụ, nʼọnọdụ ịgba ọtọ na ụkọ ka ị ga-efe ndị iro ahụ Onyenwe anyị na-ezite imegide gị. Ọ ga-anyakwasị yoku igwe nʼolu gị ruo mgbe ọ lara gị nʼiyi.
49Onyenwe anyị ga-eme ka mba si nʼebe dị anya na nsọtụ ụwa, bịakwasị gị, imegide gị. Mba a ga-adị gara gara dịka ugo, ọ ga-abụkwa mba ị na-amaghị asụsụ ha,
50Mba na-enweghị ihu ọchị nke na-adịghị asọpụrụ okenye maọbụ were ihuọma leta ụmụntakịrị.
51Ha ga-erichapụ mkpụrụ nke anụ ụlọ gị niile na mkpụrụ nke ihe ubi gị niile tutu ruo mgbe ị ghọrọ ihe e bibiri ebibi. O nwekwaghị ihe ga-afọdụrụ gị, maọbụ ọka, maọbụ mmanya ọhụrụ maọbụ mmanụ oliv, maọbụ ụmụ ehi maọbụ ewu na atụrụ gị mụrụ, ruo mgbe e mere ka ị laa nʼiyi.