Diuteronomi 29

na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.

Deuteronomy 29:11 (UKJV) Your little ones, your wives, and your stranger that is in your camp, from the hewer of your wood unto the drawer of your water:

9Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma.

10Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa,

11na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.

12Unu guzo nʼebe a taa ka unu na Onyenwe anyị Chineke gbaa ndụ. Unu guzokwa, maka ọgbụgba ndụ a unu na Onyenwe anyị na-agba taa, nke e ji ịṅụ iyi mesie ike,

13ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.