7Mgbe unu rutere ebe a, Saịhọn, eze ndị Heshbọn, na Ọg, eze ndị Bashan, pụtara ibuso anyị agha, ma anyị lụgburu ha.
8Anyị weere ala ha nye agbụrụ Ruben, na Gad, na otu ọkara ebo Manase, dịka ihe nketa ha.
9Nʼihi ya, lezie anya idebe ụkpụrụ niile nke ọgbụgba ndụ a, ka ihe niile unu na-eme gaara unu nke ọma.
10Unu niile, ndị ndu unu, na ndịisi unu, na okenye, na ndịisi ọchịchị, na ndị ikom niile nke Izrel, unu ndị guzo nʼihu Onyenwe anyị Chineke taa,
11na ụmụntakịrị unu, na ndị nwunye unu, na ndị ọbịa bi nʼetiti unu, ndị na-egburu unu nkụ, na ndị na-echukwara unu mmiri.