Diuteronomi 29

ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a.

Deuteronomy 29:15 (UKJV) But with him that stands here with us this day before the LORD our God, and also with him that is not here with us this day:

13ime ka ọ pụta ìhè nye unu taa na unu bụ ndị nke ya, imekwa ka unu mata na ọ bụ Chineke unu, dịka o kwere nna nna unu ha, Ebraham, na Aịzik, na Jekọb na nkwa.

14Ọgbụgba ndụ a nke ya na ịṅụ iyi so nke m na-eme ka ọ dịrị abụghị naanị nʼihi unu,

15ndị soro anyị guzo nʼebe a taa, nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị, kama ọ bụkwa nʼihi ndị ahụ na-anọghị nʼebe a.

16Unu onwe unu maara otu anyị si bie nʼala Ijipt, na otu anyị si gafee mba ndị ahụ niile anyị gafere nʼụzọ.

17Unu hụrụ nʼetiti ha ihe arụ ha niile, na arụsị niile e ji osisi, na nkume na ọlaọcha, na ọlaedo kpụọ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.