Diuteronomi 3

Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”

Deuteronomy 3:2 (UKJV) And the LORD said unto me, Fear him not: for I will deliver him, and all his people, and his land, into your hand; and you shall do unto him as you did unto Sihon king of the Amorites, which dwelt at Heshbon.

1Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei.

2Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”

3Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ.

4Nʼoge ahụ, anyị lụgburu obodo ya. Ọ dịghị obodo ọbụla nʼime iri obodo isii ahụ niile nke anyị na-anaraghị ha, ya bụ akụkụ Agob niile bụ alaeze Ọg nʼime Bashan.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.