1Ihe ọzọ bụ na anyị chigharịrị, gbagoo nʼụzọ gawara Bashan. Ma Ọg, eze Bashan, ya na ndị agha ya niile biliri chịrị agha pụta izute anyị nʼagha na Edrei.
2Ma Onyenwe anyị gwara m okwu, sị, “Atụla ya egwu, nʼihi na ewerela m ya na ndị agha ya niile, na ala ya, nyefee gị nʼaka. Mee ya ihe i mere Saịhọn eze ndị Amọrait, onyeisi obodo Heshbọn.”
3Ya mere, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nyefere Ọg, eze Bashan na ndị agha ya niile nʼaka anyị. Anyị gbuchapụkwara ha niile, na-ahapụghị onye ọbụla ndụ.