Diuteronomi 30

Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu.

Deuteronomy 30:3 (UKJV) That then the LORD your God will turn your captivity, and have compassion upon you, and will return and gather you from all the nations, where the LORD your God has scattered you.

1Mgbe ihe ndị a niile ga-emezu nʼebe unu nọ, ya bụ, ngọzị niile na ọbụbụ ọnụ niile m gụpụtara nʼihu unu, ọ bụrụ na unu ga na-atụgharị uche na ha nʼetiti mba ndị ahụ Onyenwe anyị Chineke unu ga-achụba unu,

2ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa.

3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu.

4A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu.

5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.