2ọ bụrụkwa na unu ekpebie nʼobi unu nʼoge ahụ ịlọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, ọ bụrụ na unu, na ụmụ unu ga-eji obi unu niile na mmụọ unu niile mezuo iwu ndị a niile m nyere unu taa.
3Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-anapụta unu. Ọ ga-enwe obi ebere nʼebe unu nọ kpọkọtakwa unu site na mba niile ebe ọ chụsasịrị unu.
4A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu.
5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha.
6Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ.