Diuteronomi 30

Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ.

Deuteronomy 30:6 (UKJV) And the LORD your God will circumcise yours heart, and the heart of your seed, to love the LORD your God with all yours heart, and with all your soul, that you may live.

4A sịkwarị na ọ bụ nʼala dị na nsọtụ ụwa nʼokpuru eluigwe ka a chụgara unu, nʼebe ahụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị ga-achịkọta unu, kpọghachitekwa unu.

5Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọlata unu nʼala ahụ bụ nke nna nna unu ha. Unu ga-enwetakwa ya, ọ ga-eme ka ihe gara unu nke ọma, meekwa ka unu baa ụba karịa nna nna unu ha.

6Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ.

7Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu.

8Unu ga-emesịakwa rubere Onyenwe anyị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.