8Mgbe Onye kachasị ihe niile elu nyere mba ọbụla ihe nketa nke ha, mgbe o kesara ụmụ mmadụ, mgbe o guzobere oke ala nye ndị niile dịka ọnụọgụgụ ụmụ Izrel si dị.
9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.
10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,
11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya,
12Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.