9Nʼihi na oke Onyenwe anyị nwetara bụ ndị ya Jekọb bụ ihe nketa e kenyere ya.
10Nʼala dị nʼọzara ka ọ chọtara ya, nʼala tọgbọrọ nʼefu, nke kpọrọ nkụ. O kpuchitere ya, lezie ya anya, o chebere ya dịka ọ bụ mkpụrụ anya ya,
11dịka ugo nke na-akpọte ụmụ dị nʼakwụ ya, nke na-erugharị nʼelu ụmụ ya, nke na-agbasapụ nku ya ijide ha, nke na-ebu ha na nku ya,
12Onyenwe anyị naanị ya duru ya, chi ala ọzọ esokwaghị ya.
13O mere ka ọ rịkwasị nʼebe niile dị elu nke ala ahụ, jiri mkpụrụ na-amị nʼala ubi ahụ zụọ ya. O ji mmanụ aṅụ si na nkume zụọ ya, ya na mmanụ si nʼoke nkume,