Diuteronomi 32

Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta.

Deuteronomy 32:2 (UKJV) My doctrine shall drop as the rain, my speech shall distil as the dew, as the small rain upon the tender herb, and as the showers upon the grass:

1Gee ntị, gị eluigwe, nụrụ ihe m na-ekwu! Gee ntị, ụwa, nụrụ okwu si m nʼọnụ.

2Ka okwu m daa dịka mmiri ozuzo ka okwu m daa dịka igirigi, ka ọ daa dịka nshansha mmiri nʼelu ahịhịa, dịka oke mmiri ozuzo nʼahịhịa na-epupụta epupụta.

3Aga m eto aha Onyenwe anyị toonu ịdị ukwuu Chineke anyị!

4Ọ bụ oke nkume ahụ, ọrụ ya zuruoke, ụzọ ya niile ziri ezi. Chineke kwesiri ntụkwasị obi, nke na-adịghị eme ihe ọjọọ, onye ezi omume na onye ziri ezi ka ọ bụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.