Diuteronomi 32

Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.

Deuteronomy 32:22 (UKJV) For a fire is kindled in mine anger, and shall burn unto the low hell, and shall consume the earth with her increase, and set on fire the foundations of the mountains.

20“Aga m ezo ihu m nʼebe ha nọ,” ka o kwuru, “ka m hụ ihe ọnọdụ ikpeazụ ha ga-abụ, nʼihi na ha bụ ọgbọ gbagọrọ agbagọ, ụmụ na-ekwesighị ntụkwasị obi.

21Ha esitela nʼihe na-abụghị chi kpalie ekworo m, jiri arụsị ha na-abaghị uru mee ka iwe wee m. Mụ onwe m ga-esite na ndị na-abụghị ndị kpalie ekworo ha, sitekwa na mba na-enweghị nghọta kpalie iwe ya.

22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.

23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha.

24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.