22Nʼihi na a mụnyela ọkụ nʼọnụma m, ọkụ ga-enwu ruo ala mmụọ nʼokpuru ụwa. Ọ ga-erepịa ụwa na mkpụrụobi niile, ọ ga-amụnye ọkụ na ntọala ugwu ukwu niile.
23“Aga m ekpokwasị mbibi nʼelu ha, zipụ àkụ m niile megide ha.
24Aga m eziga ọnwụ na-eripịa eripịa megide ha, na ịla nʼiyi nke na-ebibi ebibi, na ọrịa ọjọọ na-egbu egbu. Aga m eziga anụ ọhịa ndị ga-eji eze tapịasịa ha, na ajụala na-akpụ akpụ nʼuzuzu, nke elo ọnwụ dị nʼọnụ ya.
25Nʼokporoụzọ, mma agha ga-eme ka ha gbara aka ụmụ, nʼime ụlọ ha, ihe oke egwu ga-abịakwasị ha. Ụmụ okorobịa na agbọghọbịa ga-ala nʼiyi, ọ bụladị ụmụntakịrị na ndị agadi isi awọ.
26Ekwuru m na m ga-achụsasị ha, hichapụ ncheta ọbụla banyere ha nʼetiti ụmụ mmadụ.