29A sịkwarị na ha maara ihe, nwee uche nakwa ịghọta ihe ikpeazụ ha ga-abụ.
30Kedụ ka otu onye ga-esi chụọ otu puku mmadụ ọsọ, kedụ ka mmadụ abụọ ga-esi chụọ iri puku mmadụ ọsọ, ma ọ bụghị na Oke Nkume ha erefuola ha, ma ọ bụghị na Onyenwe anyị echepụla ihu ya nʼebe ha nọ?
31Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.
32Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.
33Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ.