Diuteronomi 32

Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ.

Deuteronomy 32:33 (UKJV) Their wine is the poison of dragons, and the cruel venom of asps.

31Nʼihi na nkume ha adịghị ka Nkume anyị, dịka ndị iro anyị, nʼonwe ha, jiri ọnụ ha kwuo.

32Osisi vaịnị ha si nʼosisi vaịnị Sọdọm, na nʼubi dị na Gọmọra mkpụrụ vaịnị ha jupụtara na nsi, ụyọkọ vaịnị ha jupụtara nʼilu ilu.

33Mmanya vaịnị ha bụ elo agwọ, elo ajụala na-ebute ọnwụ.

34“Nke a ọ bụghị ihe m dokọtarala chere oge, chezie ha nke ọma nʼụlọakụ m?

35Ọ bụ m ka ịbọ ọbọ dịrị m, aga m akwụghachi. Mgbe oge ruru ụkwụ ha ga-agbuchapụ, ụbọchị mbibi ha na-abịa nso, ịla nʼiyi ha chị ọsọ na-abịakwasị ha.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.