Diuteronomi 33

na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,

Deuteronomy 33:14 (UKJV) And for the precious fruits brought forth by the sun, and for the precious things put forth by the moon,

12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”

13Banyere Josef o kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala,

14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,

15na onyinye ọma niile si nʼugwu ukwu ochie, na ịba ụba ugwu ebighị ebi ndị ahụ,

16na onyinye ọma niile si nʼala na uju ya niile, na ihuọma onye ahụ na-ebi nʼọhịa nta ahụ na-enwu ọkụ. Ka ihe ndị a niile dịrị nʼisi Josef, nʼiku anya onye bụ nwa eze, nʼetiti ụmụnna ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.