10Ọ na-akụziri Jekọb ikpe gị, na-akụzikwara Izrel iwu gị. Ọ na-achụkwa aja ụda na-esi isi ụtọ nʼihu gị, na-achụkwa aja nsure ọkụ nʼebe ịchụ aja gị.
11Gọzie akụnụba ya Onyenwe anyị, ka ọrụ aka ya bụrụkwa ihe na-atọ gị ụtọ. Tijie ụkwụ ndị niile na-ebili imegide ya, tigbuo ndị iro ya ka ha ghara inwe ike ibili ọzọ.”
12Mosis kwuru banyere ebo Benjamin sị, “Ka onye ahụ Onyenwe anyị hụrụ nʼanya zuru ike na-atụghị ụjọ nʼime ya. Nʼihi na ọ ga-ekpuchi ya ogologo ụbọchị niile. Ọ bụkwa nʼetiti ubu ya abụọ ka onye Onyenwe anyị hụrụ nʼanya na-anọ.”
13Banyere Josef o kwuru sị, “Ka Onyenwe anyị gọzie ala ya, ya jiri igirigi dị oke ọnụahịa nke eluigwe dị nʼelu, na ogbu mmiri dị nʼokpuru ala,
14na ihe ọma niile anyanwụ na-eweta, na ihe ọma niile ọnwa na-ewepụta,