20Banyere Gad, o kwuru sị, “Ngọzị na-adịrị onye ahụ na-eme ka ebe obibi Gad saa mbara. Gad na-ebi dịka ọdụm, na-adọkapụ aka maọbụ isi.
21Ọ họọrọ ala nke kachasị mma nye onwe ya; oke ruuru onyendu ka e wepụrụ dobere ya. Mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ, o mezuru ezi ihe dị Onyenwe anyị nʼobi, na ikpe ya niile banyere Izrel.”
22Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.”
23Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.”
24Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya.