22Banyere Dan, o kwuru sị, “Dan bụ nwa ọdụm, onye na-esi na Bashan mapụta.”
23Banyere Naftalị, o kwuru sị, “Naftalị bụ onye njupụta nke ihuọma Onyenwe anyị dịrị, o jupụtakwara na ngọzị ya, ọ ga-eketa akụkụ ndịda nke iyi ukwu.”
24Banyere Asha, o kwuru sị, “Onye a gọziri karịchasịa nʼụmụ ndị ikom ka Asha bụ, ka ihe banyere ya tọọ ụmụnna ya ụtọ, ka o jirikwa mmanụ saa ụkwụ ya.
25Ihe mkpọchi nke ọnụ ụzọ ama gị ga-abụ bronz na igwe, dịka ụbọchị ndụ gị niile si dị, otu a ka ịdị ike gị ga-adị.
26“O nweghị onye dịka Chineke Jeshurun, onye na-agba eluigwe dịka ịnyịnya ịbịa inyere gị aka, onye na-agba igwe ojii dịka ịnyịnya nʼịdị ukwuu ya.