27Chineke ebighị ebi bụ ebe mgbaba gị. Nʼokpuru gị ka aka ebighị ebi ya dị. Ọ ga-esite nʼihu gị chụpụ ndị iro gị, kwuokwa sị, ‘Bibie ha!’
28Ya mere Izrel ga-ebi naanị ya nʼudo, isi iyi mmiri Jekọb dị chịm, nʼala ahụ jupụtara na mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ ebe igirigi nke eluigwe na-ada.
29Onye a gọziri agọzi ka ị bụ, gị Izrel, onye dị ka gị ndị Onyenwe anyị zọpụtara? Ọ bụ ọta gị na onye inyeaka gị, na mma agha gị dị ebube. Ndị iro gị ga-eji egwu daa nʼihu gị, ị ga-azọdakwa ebe ha niile dị elu.”