2Ọ sịrị, “Onyenwe anyị si nʼugwu Saịnaị bịa, ọ waliteere ha site nʼugwu Sia, o nwupụtara site nʼugwu Paran Ya na igwe ndị nsọ so bịa site nʼakụkụ ndịda, site nʼala ala ugwu ahụ.
3Nʼezie, ọ bụ gị na-ahụ ndị mmadụ ahụ nʼanya, ndị nsọ ahụ niile dị gị nʼaka. Nʼụkwụ gị ka ha na-ada kpọọ isiala, gị na-akụziri ha ihe,
4iwu ahụ Mosis nyere anyị, ihe onwunwe nke ọgbakọ Jekọb.
5Ọ bụ ya bụ eze na Jeshurun, mgbe ndị ndu ndị mmadụ zukọrọ ha na ebo niile nke Izrel.
6“Ka ebo Ruben dịrị ndụ ghara ịnwụ, ma ka ọnụọgụgụ ndị ikom ya dịrị ole na ole.”