1Mgbe ahụ, Mosis sitere na mbara ala Moab rigoruo nʼelu nʼugwu Nebo, ruo nʼelu Pisga, nke dị na ncherita ihu Jeriko. Nʼebe ahụ Onyenwe anyị mere ka ọ hụ ala ahụ niile anya site na Gilead ruo Dan;
2ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
3Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”