2ya na ala Naftalị niile nʼoke ala Ifrem, na nke Manase, na ala Juda niile ruo nʼosimiri Mediterenịa.
3Mosis hụkwara ala Negev, na akụkụ ala ahụ niile dị site na Ndagwurugwu Jeriko, obodo nkwụ, ruo Zoa.
4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”
5Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.
6Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.