Diuteronomi 34

Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.

Deuteronomy 34:6 (UKJV) And he buried him in a valley in the land of Moab, opposite to Bethpeor: but no man knows of his tomb unto this day.

4Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị ya, “Nke a bụ ala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee Ebraham, Aịzik na Jekọb nkwa mgbe m kwuru sị, ‘Aga m enye ya ụmụ ụmụ gị.’ Ugbu a emeela m ka i jiri anya gị hụ ya ma ị gaghị agabiga banye nʼime ya.”

5Ya mere, Mosis, onyeozi Onyenwe anyị nwụrụ nʼebe ahụ, nʼala Moab, dịka Onyenwe anyị kwuru.

6Onyenwe anyị liri ya na Moab, na ndagwurugwu chere ihu na Bet-Peoa, ma ruo taa, ọ dịghị onye ọbụla maara ebe ili ya dị.

7Mosis gbara narị afọ na iri afọ abụọ mgbe ọ nwụrụ, ma nʼoge ahụ ike ka dị ya nʼahụ, anya ya na-ahụkwa ụzọ nke ọma.

8Ụmụ Izrel ruru ụjụ nʼihi Mosis, iri ụbọchị atọ nʼobosara ala Moab, tutu ruo mgbe oge iru ụjụ na ịkwa akwa gasịrị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.