Diuteronomi 4

Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.

Deuteronomy 4:24 (UKJV) For the LORD your God is a consuming fire, even a jealous God.

22Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ.

23Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.

24Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.

25Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke unu, ma kpasuo ya iwe

26ana m akpọku eluigwe na ụwa ka ha bụrụ ndị akaebe mụ na unu taa, na a ga-ala unu nʼiyi ngwangwa nʼala ahụ bụ nke unu na-agafe Jọdan inweta. Unu agaghị ebi ogologo oge nʼebe ahụ, nʼihi na a ga-ekpochapụ unu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.