Diuteronomi 4

Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.

Deuteronomy 4:23 (UKJV) Take heed unto yourselves, lest all of you forget the covenant of the LORD your God, which he made with you, and make you a graven image, or the likeness of any thing, which the LORD your God has forbidden you.

21Onyenwe anyị wesoro m iwe nʼihi unu, ọ ṅụrụ iyi na m agaghị agafe osimiri Jọdan ịbanye nʼala ọma ahụ nke Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa gị.

22Aghaghị m ịnwụ nʼala a. Agaghị m agafe Jọdan. Ma unu ga-agafe gaa nweta ala ọma ahụ.

23Lezienụ anya ka unu ghara ichefu ọgbụgba ndụ unu na Onyenwe anyị Chineke unu nwekọrọ, unu emerela onwe unu arụsị yiri ụdịdị ihe ọbụla, ndị ahụ iwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere megidere.

24Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ ọkụ na-erepịa erepịa. Ọ bụ Chineke ekworo.

25Mgbe ị ga-amụ ụmụ, nwekwa ụmụ ụmụ, mgbe unu birila ọtụtụ oge nʼala ahụ, ọ bụrụ na unu emerụọ onwe unu site nʼimere onwe unu ụdị arụsị ọbụla, si otu a mee ihe dị njọ nʼanya Onyenwe anyị Chineke unu, ma kpasuo ya iwe

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.