Diuteronomi 4

Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla.

Deuteronomy 4:32 (UKJV) For ask now of the days that are past, which were before you, since the day that God created man upon the earth, and ask from the one side of heaven unto the other, whether there has been any such thing as this great thing is, or has been heard like it?

30Mgbe mkpagbu bịara, mgbe ihe ilu ndị a bịakwasịrị unu nʼoge dị nʼihu, unu ga-emesịa lọghachikwute Onyenwe anyị Chineke unu, unu ga-egekwa ntị nʼihe ọ ga-agwa unu.

31Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke unu bụ Chineke na-eme ebere. Ọ gaghị agọnarị unu maọbụ laa unu nʼiyi, maọbụ chefuo ọgbụgba ndụ ya na nna nna unu ha gbara, nke o ji iyi ọ ṅụrụ mesie ike.

32Nyochaanụ ihe mere nʼoge gara aga, tupu a mụọ unu, na tupu Chineke ekee mmadụ nʼụwa. Jụọnụ ajụjụ nʼụwa niile, jụta ma ihe ukwu dị otu a o metụla mgbe ọbụla.

33O nweela ndị mmadụ nụrụ olu Chineke mgbe o si nʼọkụ gwa ha okwu dịka unu mere, ma ha anwụghị?

34O nweela chi ọzọ nwara ka o site na mba ọzọ nwetara onwe ya otu mba, site nʼihe nwalee, site nʼihe ịrịbama na ihe ebube dị iche iche, site nʼagha, nʼaka dị ike, na ogwe aka esetipụrụ esetipụ, maọbụ nʼihe dị oke egwu dị iche iche, dịka ihe niile nke Onyenwe anyị Chineke unu mere nʼala Ijipt nʼihu anya unu abụọ?

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.