35O gosiri unu ihe ndị a ka unu mara na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼezie, na ọ dịkwaghị onye ọzọ ma ọ bụghị ya.
36O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ.
37Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a.
38Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa.
39Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.