37Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a.
38Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa.
39Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.
40Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
41Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan,