Diuteronomi 4

Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan,

Deuteronomy 4:41 (UKJV) Then Moses severed three cities on this side Jordan toward the sunrising;

39Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya.

40Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.

41Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan,

42ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya.

43Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.