Diuteronomi 5

“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ịbụ ohu.

Deuteronomy 5:6 (UKJV) I am the LORD your God, which brought you out of the land of Egypt, from the house of bondage.

4Onyenwe anyị sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ.

5E guzoro m nʼetiti unu na Onyenwe anyị mgbe ahụ, ikwupụtara unu okwu Onyenwe anyị, nʼihi na unu tụrụ egwu ọkụ ahụ, unu arịgoghịkwa nʼugwu ahụ. Ọ sịrị:

6“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ịbụ ohu.

7“Gị enwela chi ọzọ tinyere m.

8Gị emerela onwe gị arụsị a pịrị apị, nʼoyiyi nke ụdị ọbụla nke yiri ihe dị nʼeluigwe maọbụ nke yiri ihe dị nʼụwa, nʼokpuru ya maọbụ nʼime mmiri, nʼokpuru ụwa.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.