Diuteronomi 5

Onyenwe anyị sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ.

Deuteronomy 5:4 (UKJV) The LORD talked with you face to face in the mount out of the midst of the fire,

2Anyị na Onyenwe anyị Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb.

3Ọ bụghị Onyenwe anyị na nna nna anyị ha gbara ndụ, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa.

4Onyenwe anyị sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ.

5E guzoro m nʼetiti unu na Onyenwe anyị mgbe ahụ, ikwupụtara unu okwu Onyenwe anyị, nʼihi na unu tụrụ egwu ọkụ ahụ, unu arịgoghịkwa nʼugwu ahụ. Ọ sịrị:

6“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke unu, onye kpọpụtara unu site nʼIjipt, bụ ala nke ịbụ ohu.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.