Diuteronomi 5

Anyị na Onyenwe anyị Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb.

Deuteronomy 5:2 (UKJV) The LORD our God made a covenant with us in Horeb.

1Mosis kpọkọtara Izrel niile gwa ha okwu sị, Geenụ ntị, unu Izrel, nʼụkpụrụ ndị a na iwu ndị a niile m na-agụpụta na ntị unu taa, mụtanụ ha, hụkwanụ na unu debere ha!

2Anyị na Onyenwe anyị Chineke anyị gbara ndụ nʼugwu Horeb.

3Ọ bụghị Onyenwe anyị na nna nna anyị ha gbara ndụ, kama ọ bụ anyị na ya, anyị niile ndị dị ndụ taa.

4Onyenwe anyị sitere nʼetiti ọkụ gwa unu okwu ihu na ihu nʼugwu ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.