Diuteronomi 9

Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.

Deuteronomy 9:21 (UKJV) And I took your sin, the calf which all of you had made, and burnt it with fire, and stamped it, and ground it very small, even until it was as small as dust: and I cast the dust thereof into the brook that descended out of the mount.

19Atụrụ m egwu iwe na ọnụma nke Onyenwe anyị, nʼihi na iwe ya dị ukwuu megide unu ruo na ikpochapụ unu. Ma nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gere ntị nʼarịrịọ m.

20Nʼoge ahụ, Erọn nʼonwe ya, nọrọ nʼoke nsogbu, nʼihi na Onyenwe anyị were iwe megide ya, chọọ ibibi ya, ma arịọrọ m Onyenwe anyị arịrịọ nʼihi ya.

21Mgbe ahụ, eweere m ngwa ọrụ mmehie unu, ya bụ nwa ehi ahụ unu kpụrụ, kpọọ ya ọkụ, tipịa ya, gwerie ya nke ọma dịka ntụ, wụnye ntụ ya nʼime mmiri nke si nʼugwu na-asọpụta.

22Ọzọkwa, unu kpasuru Onyenwe anyị iwe na Tabera, na Masa, ọ bụladị na Kibrọt Hataava.

23Mgbe Onyenwe anyị si na Kadesh Banea zipụ unu ọ sị unu, “Gaanụ nweta ala ahụ m nyere unu.” Ma unu nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị Chineke unu nyere unu. Unu ekwenyeghị maọbụ rubere ya isi.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.