Ekiliziastis 2

Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.

Ecclesiastes 2:14 (UKJV) The wise man's eyes are in his head; but the fool walks in darkness: and I myself perceived also that one event happens to them all.

12Atụgharịrị m bido ịmụ ihe banyere amamihe, na ịyị ara na nzuzu. Olee ihe ọzọ nke onye ga-anọchi anya eze ga-eme, karịa ihe ndị ahụ e merela na mbụ?

13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.

14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.

15Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.

16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.