13Achọpụtara m na amamihe dị mma karịa nzuzu, dịka ìhè si dị mma karịa ọchịchịrị.
14Nʼihi na onye maara ihe na-ahụ ụzọ ma isi kpuru onye nzuzu. Ma achọpụtakwara m na otu ihe ndaba na-adabara onye amamihe na onye nzuzu.
15Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.