15Agwara m onwe m okwu sị, “Dịka onye nzuzu ga-anwụ, otu ahụ kwa ka m ga-anwụ. Gịnị bụ uru amamihe m niile bara?” Ekwuru m nʼobi m sị, “Ihe a bụkwa ihe efu.
16Nʼihi na onye maara ihe na onye nzuzu bụ ndị a na-agaghị echeta ihe banyere ogologo oge dị nʼihu. Nʼụbọchị ndị na-abịa nʼihu, a gaghị echeta ha. Onye amamihe na onye nzuzu aghaghị ịnwụ.”
17Ya mere, akpọrọ m ịdị ndụ asị, nʼihi na ọrụ a na-arụ nʼokpuru anyanwụ wutere m. Ihe efu ka ọ bụ; ọ dị ka ịchụgharị ifufe.
18Ihe niile m gbalịrị ịrụpụta ka m kpọrọ asị, nʼihi na amaara m na emesịa, aga m ahapụrụ ha onye ọzọ na-abịa nʼazụ m.
19Onye maara ma ọ ga-abụ onye maara ihe ma ọ ga-abụkwanụ onye nzuzu? Ma ihe niile m ji amamihe ǹka m na ike m rụpụta nʼokpuru anyanwụ ga-abụ nke ya! Ihe a bụ ihe efu.