14Nwata dị otu a, ma eleghị anya, ọ ga-esi nʼụlọ mkpọrọ pụta bụrụ eze, ma ọ bụkwanụ na a mụrụ ya ogbenye nʼalaeze ahụ.
15Ahụrụ m na mmadụ niile ndị bi nʼokpuru anyanwụ na-eso nwantakịrị ahụ onye nọchiri anya eze.
16A pụghị ịgụta ndị dịnyere ya, ma ndị ga-esota nʼazụ agaghị enwe ọṅụ nʼebe onye nọchiri eze ahụ nọ. Ọzọkwa, nke a bụ ihe efu, naanị ịchụso ifufe.